1Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
2“Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼụzọ Jerusalem, buo amụma megide ụlọnsọ ukwu ahụ. Bukwaa amụma megide ala Izrel
3sị ala Izrel otu a, ‘Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, Mụ onwe m na-emegide gị. Aga m esite nʼọbọ mịpụta mma agha m, site na gị gbuchapụ ma onye ezi omume na onye ajọ omume.