Izikiel 21

“Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼụzọ Jerusalem, buo amụma megide ụlọnsọ ukwu ahụ. Bukwaa amụma megide ala Izrel

Ezekiel 21:2 (UKJV) Son of man, set your face toward Jerusalem, and drop your word toward the holy places, and prophesy against the land of Israel,

1Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

2“Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼụzọ Jerusalem, buo amụma megide ụlọnsọ ukwu ahụ. Bukwaa amụma megide ala Izrel

3sị ala Izrel otu a, ‘Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, Mụ onwe m na-emegide gị. Aga m esite nʼọbọ mịpụta mma agha m, site na gị gbuchapụ ma onye ezi omume na onye ajọ omume.

4Nʼihi na m na-aga igbuchapụ ndị ezi omume na ndị ajọ omume, mma agha m ga-esite nʼọbọ ya pụta megide onye ọbụla site nʼugwu ruo na ndịda.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.