43Mgbe ahụ, ihe m kwuru banyere nwanyị ahụ ịkwa iko riri ahụ bụ nke a, ‘Ugbu a, ka ha mesoo ya mmeso dịka onye na-agba akwụna, nʼihi na nke ahụ ka ọ bụ.’
44Ha bara dinakwuru ya. Dịka ndị ikom si abakwuru nwanyị akwụna, otu a ka ha si bakwuru ụmụ nwanyị ndụ ọjọọ a bụ Ohola na Oholiba.
45Ma ndị ikpe ezi omume ga-ama ha ụdị ikpe a na-ama ndị inyom na-akwa iko na ndị na-awụsikwa ọbara. Nʼihi na ha bụ ndị na-akwa iko, na ndị ọbara dị nʼaka ha.
46“Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, aga m akpọkọta igwe ndị mmadụ ga-emegide ha, nyefee ha nʼaka oke ihe egwu, nakwa ihe nlụta nʼagha.
47Mkpọkọta mmadụ ahụ ga-atụ ha nkume, werekwa mma agha gbudasịa ha. Ha ga-egbu ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom, kpọkwaa ụlọ ha niile ọkụ.