45Ma ndị ikpe ezi omume ga-ama ha ụdị ikpe a na-ama ndị inyom na-akwa iko na ndị na-awụsikwa ọbara. Nʼihi na ha bụ ndị na-akwa iko, na ndị ọbara dị nʼaka ha.
46“Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, aga m akpọkọta igwe ndị mmadụ ga-emegide ha, nyefee ha nʼaka oke ihe egwu, nakwa ihe nlụta nʼagha.
47Mkpọkọta mmadụ ahụ ga-atụ ha nkume, werekwa mma agha gbudasịa ha. Ha ga-egbu ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom, kpọkwaa ụlọ ha niile ọkụ.
48“Otu a, aga m eme ka ibi ndụ ọjọọ kwụsị nʼala ahụ, ka esi otu a adọ ndị inyom niile aka na ntị, ka ha hapụ ịgbaso nzọ ụkwụ gị.
49Ị ghaghị ịta ahụhụ nʼihi ndụ ọjọọ nke ịkwa iko gị, hụkwaa ahụhụ nʼihi mmehie niile nke ịkpọ isiala nye arụsị. Mgbe ahụ ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.”