Izikiel 26

Aga m emekwa ka ala gị ghọọ ala nkume nkume, nke ihe na-adịghị nʼime ya. Ị ga-abụkwa ebe ndị ọkụ azụ ga na-agbasa ụgbụ ha. Ọ dịghị onye ga-ewuzi gị ọzọ. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.

Ezekiel 26:14 (UKJV) And I will make you like the top of a rock: you shall be a place to spread nets upon; you shall be built no more: for I the LORD have spoken it, says the Lord GOD.

12Ha ga-akwara akụ gị niile, na ihe ahịa gị niile dịka ihe ha dọtara nʼagha. Ha ga-akwatu mgbidi gị niile, na ụlọ ọma gị niile, kpokọtaa osisi gị niile, na nkume niile, na ngwongwo niile nʼabaghị uru wụnye ha nʼime osimiri.

13Aga m emekwa ka ụzụ nke abụ gị niile kwụsị. A gaghị anụkwa ụda ụbọ akwara gị ọzọ.

14Aga m emekwa ka ala gị ghọọ ala nkume nkume, nke ihe na-adịghị nʼime ya. Ị ga-abụkwa ebe ndị ọkụ azụ ga na-agbasa ụgbụ ha. Ọ dịghị onye ga-ewuzi gị ọzọ. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.

15“Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-agwa Taịa, Ọ bụ na agaghị anụ mkpọtụ ọdịda gị na mba ndị ahụ niile dị nʼọnụ mmiri osimiri, mgbe ndị e merụrụ ahụ ga na-asụ ude nʼoge a na-egbu ndị bi nʼime gị?

16Mgbe ahụ, ndị ndu nʼobodo ndị ahụ niile dị nʼọnụ mmiri osimiri ga-esi nʼocheeze ha rịdata. Ha ga-eyipụ uwe mwụda ha, yipụsịakwa uwe ha niile a kpara nke ọma. Ha ga-anọdụ ọdụ nʼala na-ama jijiji site nʼoke egwu nʼihi ihe ha hụrụ dakwasịrị gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.