Izikiel 26

Ha ga-etida mgbidi Taịa niile, kwadakwa ụlọ elu ya niile. Aga m akọchapụ aja mgbidi ya dakpọrọ adakpọ mee ka ala ahụ ghọọ ala nkume nkume.

Ezekiel 26:4 (UKJV) And they shall destroy the walls of Tyrus, and break down her towers: I will also scrape her dust from her, and make her like the top of a rock.

2“Nwa nke mmadụ, Taịa aṅụrịala ọṅụ nʼihi ọdịda Jerusalem. Ọ na-ekwukwa na-asị, ‘Ahaa, agbajiela obodo ahụ bụ ọnụ ụzọ e si eje mba dị iche iche. Ọnụ ụzọ ama ya niile egherekwala oghe nye m. Ugbu a, e mebirila ya, ihe ga-agara m nke ọma karịa.’

3Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Lee, ana m eguzo imegide gị Taịa. Aga m emekwa ka ọtụtụ mba bilie bịakwasị gị dịka ebili mmiri nke oke osimiri.

4Ha ga-etida mgbidi Taịa niile, kwadakwa ụlọ elu ya niile. Aga m akọchapụ aja mgbidi ya dakpọrọ adakpọ mee ka ala ahụ ghọọ ala nkume nkume.

5Ọ ga-aghọkwa ebe ndị ọkụ azụ na-agbasa ụgbụ ha nʼetiti oke osimiri. Nʼihi na mụ onwe m ekwuola ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. Ọ ga-aghọkwara mba niile dị iche iche ihe a kwatara nʼagha.

6Ma a ga-eji mma agha laa ụmụada ya bi nʼelu ala nʼiyi. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.