Izikiel 26

Ma a ga-eji mma agha laa ụmụada ya bi nʼelu ala nʼiyi. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”

Ezekiel 26:6 (UKJV) And her daughters which are in the field shall be slain by the sword; and they shall know that I am the LORD.

4Ha ga-etida mgbidi Taịa niile, kwadakwa ụlọ elu ya niile. Aga m akọchapụ aja mgbidi ya dakpọrọ adakpọ mee ka ala ahụ ghọọ ala nkume nkume.

5Ọ ga-aghọkwa ebe ndị ọkụ azụ na-agbasa ụgbụ ha nʼetiti oke osimiri. Nʼihi na mụ onwe m ekwuola ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. Ọ ga-aghọkwara mba niile dị iche iche ihe a kwatara nʼagha.

6Ma a ga-eji mma agha laa ụmụada ya bi nʼelu ala nʼiyi. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”

7“Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Aga m esite na mgbago ugwu kpọta Nebukadneza eze Babilọn, onye bụ eze ndị eze, ọ ga-achị ọtụtụ ndị agha na ụgbọala, na ndị na-agba ịnyịnya bilie imegide Taịa.

8Ọ ga-ebu ụzọ jiri mma agha bibie ndị gị bi nʼelu ala. Ọ ga-agbakwa obodo gị gburugburu, wulie mgbidi agha ya elu, imegide mgbidi obodo gị. Ọ ga-ewelikwa ọta agha ya elu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.