5Ọ ga-aghọkwa ebe ndị ọkụ azụ na-agbasa ụgbụ ha nʼetiti oke osimiri. Nʼihi na mụ onwe m ekwuola ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. Ọ ga-aghọkwara mba niile dị iche iche ihe a kwatara nʼagha.
6Ma a ga-eji mma agha laa ụmụada ya bi nʼelu ala nʼiyi. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”
7“Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Aga m esite na mgbago ugwu kpọta Nebukadneza eze Babilọn, onye bụ eze ndị eze, ọ ga-achị ọtụtụ ndị agha na ụgbọala, na ndị na-agba ịnyịnya bilie imegide Taịa.
8Ọ ga-ebu ụzọ jiri mma agha bibie ndị gị bi nʼelu ala. Ọ ga-agbakwa obodo gị gburugburu, wulie mgbidi agha ya elu, imegide mgbidi obodo gị. Ọ ga-ewelikwa ọta agha ya elu.
9Ọ ga-echezikwa ihe agha e ji akwatu mgbidi nʼebe mgbidi gị dị, jiri ngwa agha ya kwada ụlọ elu gị niile.