Izikiel 27

“ ‘Ndị ikom Peshịa na Lidiya, na Put, jere gị ozi dịka ndị agha nʼusuu ndị agha gị. Ha kokwasịrị ọta ha na okpu agha igwe ha nʼaja ụlọ gị, na-ewetara gị ebube.

Ezekiel 27:10 (UKJV) They of Persia and of Lud and of Phut were in yours army, your men of war: they hanged the shield and helmet in you; they set forth your loveliness.

8Ndị ikom si Saịdọn na Avad bụ ndị na-akwọrọ gị ụgbọ mmiri gị. Ndị ǹka ndị ikom gị, gị Taịa, nọ nʼụgbọ dịka ndị ọka nʼịkwọ ụgbọ mmiri.

9Ndị okenye na ndị nka Gebal a maara aha ha nọ nʼime ụgbọ mmiri gị. Ọrụ ha bụ imechisi oghere ọbụla dị nʼụgbọ ahụ. Ụgbọ mmiri niile na ndị na-anya ha na-abata nʼọnụ mmiri gị nʼihi ịzụ ihe ahịa gị.

10“ ‘Ndị ikom Peshịa na Lidiya, na Put, jere gị ozi dịka ndị agha nʼusuu ndị agha gị. Ha kokwasịrị ọta ha na okpu agha igwe ha nʼaja ụlọ gị, na-ewetara gị ebube.

11Ndị ikom Avad, na Helek bụ ndị na-eche mgbidi gị nʼakụkụ niile. Ndị ikom Gamad na-eche nche nʼụlọ elu gị niile e wusiri ike. Ha konyekwara ọta ha nʼusoro na mgbidi gị, ime ka ịma mma gị zuo oke.

12“ ‘Tashish bụ onye ahịa gị, nʼihi ịba ụba nke akụ gị. Ọ bụ ọlaọcha na igwe, na gbamgbam, na opu, ka ha ji akwụ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.