10“ ‘Ndị ikom Peshịa na Lidiya, na Put, jere gị ozi dịka ndị agha nʼusuu ndị agha gị. Ha kokwasịrị ọta ha na okpu agha igwe ha nʼaja ụlọ gị, na-ewetara gị ebube.
11Ndị ikom Avad, na Helek bụ ndị na-eche mgbidi gị nʼakụkụ niile. Ndị ikom Gamad na-eche nche nʼụlọ elu gị niile e wusiri ike. Ha konyekwara ọta ha nʼusoro na mgbidi gị, ime ka ịma mma gị zuo oke.
12“ ‘Tashish bụ onye ahịa gị, nʼihi ịba ụba nke akụ gị. Ọ bụ ọlaọcha na igwe, na gbamgbam, na opu, ka ha ji akwụ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ.
13“ ‘Ndị Griis, Tubal na Meshek, bụkwa ndị ahịa gị. Ha na-ebutere gị ndị ohu, na ihe e ji bronz kpụọ, iji kwụọ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ.
14“ ‘Otu a kwa ndị ikom Bet Togama jikwa ịnyịnya ụgbọ, na ịnyịnya agha, na ịnyịnya ibu na-agbanwere ihe ha zụrụ.