Izikiel 27

“ ‘Ndị Griis, Tubal na Meshek, bụkwa ndị ahịa gị. Ha na-ebutere gị ndị ohu, na ihe e ji bronz kpụọ, iji kwụọ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ.

Ezekiel 27:13 (UKJV) Javan, Tubal, and Meshech, they were your merchants: they traded the persons of men and vessels of brass in your market.

11Ndị ikom Avad, na Helek bụ ndị na-eche mgbidi gị nʼakụkụ niile. Ndị ikom Gamad na-eche nche nʼụlọ elu gị niile e wusiri ike. Ha konyekwara ọta ha nʼusoro na mgbidi gị, ime ka ịma mma gị zuo oke.

12“ ‘Tashish bụ onye ahịa gị, nʼihi ịba ụba nke akụ gị. Ọ bụ ọlaọcha na igwe, na gbamgbam, na opu, ka ha ji akwụ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ.

13“ ‘Ndị Griis, Tubal na Meshek, bụkwa ndị ahịa gị. Ha na-ebutere gị ndị ohu, na ihe e ji bronz kpụọ, iji kwụọ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ.

14“ ‘Otu a kwa ndị ikom Bet Togama jikwa ịnyịnya ụgbọ, na ịnyịnya agha, na ịnyịnya ibu na-agbanwere ihe ha zụrụ.

15“ ‘Ndị ahịa si na Dedan bụkwa ndị ahịa gị. Otu a kwa ọtụtụ ndị bi nʼọnụ mmiri bụkwa ndị ahịa gị. Ha ji ọdụ, na osisi eboni kwụọ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.