22“ ‘Ndị ahịa Sheba, na Raama, bụkwa ndị ahịa gị. Ha ji ụda dị iche iche na nkume dị oke ọnụahịa, na ọlaedo akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ.
23“ ‘Ndị Haran, Kanne na Eden, na ndị ahịa Sheba, Ashọ na Kilmad, bụ ndị gị na ha zụkọrọ ahịa.
24Ha na-eweta uwe mara mma dị iche iche, na akwa e tejiri anụnụ anụnụ, na akwa a kpara nke ọma, na kapeeti mara mma dị iche iche, nke e ji ụdọ kpazie nke ọma, nke e tejiri nʼụdị dịkwa iche iche nʼọma ahịa gị.
25“ ‘Ụgbọ mmiri niile nke Tashish bụ ndị na-ebu ihe ahịa gị. I jupụtara nʼihe ahịa, gị obodo dị nʼetiti mmiri.
26Ndị na-anyagharị ụgbọ mmiri gị na-ebuba gị nʼosimiri. Ma ifufe siri ike nke si nʼọwụwa anyanwụ ga-etiwasị gị nʼetiti osimiri.