Izikiel 27

Ndị na-anyagharị ụgbọ mmiri gị na-ebuba gị nʼosimiri. Ma ifufe siri ike nke si nʼọwụwa anyanwụ ga-etiwasị gị nʼetiti osimiri.

Ezekiel 27:26 (UKJV) Your rowers have brought you into great waters: the east wind has broken you in the midst of the seas.

24Ha na-eweta uwe mara mma dị iche iche, na akwa e tejiri anụnụ anụnụ, na akwa a kpara nke ọma, na kapeeti mara mma dị iche iche, nke e ji ụdọ kpazie nke ọma, nke e tejiri nʼụdị dịkwa iche iche nʼọma ahịa gị.

25“ ‘Ụgbọ mmiri niile nke Tashish bụ ndị na-ebu ihe ahịa gị. I jupụtara nʼihe ahịa, gị obodo dị nʼetiti mmiri.

26Ndị na-anyagharị ụgbọ mmiri gị na-ebuba gị nʼosimiri. Ma ifufe siri ike nke si nʼọwụwa anyanwụ ga-etiwasị gị nʼetiti osimiri.

27Akụ gị niile, na ngwa ahịa gị niile, na ihe ịzụ ahịa gị niile, na ndị niile na-arụ ọrụ nʼụgbọ mmiri gị, na ndị na-anya ụgbọ mmiri, ma ndị na-edozi ụgbọ mmiri gị, ma ndị na-azụ ahịa gị, ma ndị agha gị niile, ha na ndị niile nọ nʼime ụgbọ gị ka mmiri ga-eri nʼetiti mmiri, nʼụbọchị ahụ ụgbọ gị ga-emikpu.

28Ala niile dị nʼọnụ mmiri ga-ama jijiji mgbe ndị ọka ụgbọ mmiri gị ga-eti mkpu akwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.