30Ha ga-eti mkpu akwa, ha ga-akwa akwa nke ukwuu, werekwa aja wụkwasị onwe ha nʼisi, na-atụrụkwa onwe ha na ntụ.
31Ha ga-akpụchapụ agịrị isi ha, yirikwa akwa mkpe, kwaa akwa nʼihi ịdị ilu nke mkpụrụobi ha. Ha ga-etikwa aka ha nʼobi.
32Mgbe ha ga na-eti mkpu akwa na-erikwa uju nʼihi gị, nke a bụ abụ akwa a ga-abụ banyere gị, “Onye ka e mere ka o dere duu ka e si mee obodo Taịa, nke osimiri gbara gburugburu?”
33Mgbe e si nʼime gị na-ebupụsị ihe ahịa gị, e ji ha na-enyeju mba dị iche iche afọ. E sitekwara nʼakụ gị dị ukwuu na ngwa ahịa gị mee ka ọtụtụ ndị eze nke ụwa bụrụ ọgaranya.
34Ugbu a, mmiri e riela gị, ọ bụ nʼokpuru osimiri ka ị tọgbọ. Akụ gị niile na ihe ahịa gị niile, na ndị niile nọ nʼime gị esorola gị laa nʼiyi.