Izikiel 27

Ha ga-eti mkpu akwa, ha ga-akwa akwa nke ukwuu, werekwa aja wụkwasị onwe ha nʼisi, na-atụrụkwa onwe ha na ntụ.

Ezekiel 27:30 (UKJV) And shall cause their voice to be heard against you, and shall cry bitterly, and shall cast up dust upon their heads, they shall wallow themselves in the ashes:

28Ala niile dị nʼọnụ mmiri ga-ama jijiji mgbe ndị ọka ụgbọ mmiri gị ga-eti mkpu akwa.

29Ndị niile na-anya ụgbọ mmiri, na ndị ọka ụgbọ niile nke oke osimiri, ga-esitekwa nʼụgbọ ha rịdata guzo nʼelu ala.

30Ha ga-eti mkpu akwa, ha ga-akwa akwa nke ukwuu, werekwa aja wụkwasị onwe ha nʼisi, na-atụrụkwa onwe ha na ntụ.

31Ha ga-akpụchapụ agịrị isi ha, yirikwa akwa mkpe, kwaa akwa nʼihi ịdị ilu nke mkpụrụobi ha. Ha ga-etikwa aka ha nʼobi.

32Mgbe ha ga na-eti mkpu akwa na-erikwa uju nʼihi gị, nke a bụ abụ akwa a ga-abụ banyere gị, “Onye ka e mere ka o dere duu ka e si mee obodo Taịa, nke osimiri gbara gburugburu?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.