Izikiel 27

Ihe ndị a niile ga-eju ndị bi nʼala ọnụ mmiri osimiri niile anya. Ndị eze ha niile tụkwara egwu nke ukwuu; ihu ha gbarụkwara agbarụ site nʼegwu.

Ezekiel 27:35 (UKJV) All the inhabitants of the isles shall be astonished at you, and their kings shall be sore afraid, they shall be troubled in their countenance.

33Mgbe e si nʼime gị na-ebupụsị ihe ahịa gị, e ji ha na-enyeju mba dị iche iche afọ. E sitekwara nʼakụ gị dị ukwuu na ngwa ahịa gị mee ka ọtụtụ ndị eze nke ụwa bụrụ ọgaranya.

34Ugbu a, mmiri e riela gị, ọ bụ nʼokpuru osimiri ka ị tọgbọ. Akụ gị niile na ihe ahịa gị niile, na ndị niile nọ nʼime gị esorola gị laa nʼiyi.

35Ihe ndị a niile ga-eju ndị bi nʼala ọnụ mmiri osimiri niile anya. Ndị eze ha niile tụkwara egwu nke ukwuu; ihu ha gbarụkwara agbarụ site nʼegwu.

36Ndị ahịa nke mba dị iche iche na-efufe isi ha, nʼihi na ihe mere gị dị egwu. Ị laala nʼiyi ruo ebighị ebi.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.