3sị ya, gị oke obodo dị nʼọnụ oke osimiri, onye bụ onye ahịa nke mba niile dị nʼọnụ osimiri. ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: “ ‘Gị onwe gị, bụ Taịa, na-asị, “Ezuru m oke nʼịma mma.”
4I meela ka oke ala gị dịrị nʼetiti oke osimiri. Ndị wuru gị emeekwala ka ịma mma gị zuo oke.
5Osisi e ji wuo ahụ ụgbọ gị sitere nʼosisi junipa nke si Senia; ọ bụkwa osisi sida nke si Lebanọn ka e ji jidesie ihu ụgbọ ahụ ike.
6Osisi ook nke si Bashan ka e ji mee ụmara gị niile. Osisi e si Saiprọs bubata ka e ji wuo ala ụgbọ gị, jirikwa ọdụ machie ya nʼọnọdụ ịchọ ya mma.
7Ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, nke e si Ijipt bubata, ka e ji mee ọkọlọtọ gị. Akwa ndo gị bụkwa akwa na-acha anụnụ anụnụ, na odo odo, nke e si nʼobodo ọnụ mmiri Elisha bubata.