Izikiel 27

Osisi ook nke si Bashan ka e ji mee ụmara gị niile. Osisi e si Saiprọs bubata ka e ji wuo ala ụgbọ gị, jirikwa ọdụ machie ya nʼọnọdụ ịchọ ya mma.

Ezekiel 27:6 (UKJV) Of the oaks of Bashan have they made yours oars; the company of the Ashurites have made your benches of ivory, brought out of the isles of Chittim.

4I meela ka oke ala gị dịrị nʼetiti oke osimiri. Ndị wuru gị emeekwala ka ịma mma gị zuo oke.

5Osisi e ji wuo ahụ ụgbọ gị sitere nʼosisi junipa nke si Senia; ọ bụkwa osisi sida nke si Lebanọn ka e ji jidesie ihu ụgbọ ahụ ike.

6Osisi ook nke si Bashan ka e ji mee ụmara gị niile. Osisi e si Saiprọs bubata ka e ji wuo ala ụgbọ gị, jirikwa ọdụ machie ya nʼọnọdụ ịchọ ya mma.

7Ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, nke e si Ijipt bubata, ka e ji mee ọkọlọtọ gị. Akwa ndo gị bụkwa akwa na-acha anụnụ anụnụ, na odo odo, nke e si nʼobodo ọnụ mmiri Elisha bubata.

8Ndị ikom si Saịdọn na Avad bụ ndị na-akwọrọ gị ụgbọ mmiri gị. Ndị ǹka ndị ikom gị, gị Taịa, nọ nʼụgbọ dịka ndị ọka nʼịkwọ ụgbọ mmiri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.