Izikiel 27

Ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, nke e si Ijipt bubata, ka e ji mee ọkọlọtọ gị. Akwa ndo gị bụkwa akwa na-acha anụnụ anụnụ, na odo odo, nke e si nʼobodo ọnụ mmiri Elisha bubata.

Ezekiel 27:7 (UKJV) Fine linen with broidered work from Egypt was that which you spread forth to be your sail; blue and purple from the isles of Elishah was that which covered you.

5Osisi e ji wuo ahụ ụgbọ gị sitere nʼosisi junipa nke si Senia; ọ bụkwa osisi sida nke si Lebanọn ka e ji jidesie ihu ụgbọ ahụ ike.

6Osisi ook nke si Bashan ka e ji mee ụmara gị niile. Osisi e si Saiprọs bubata ka e ji wuo ala ụgbọ gị, jirikwa ọdụ machie ya nʼọnọdụ ịchọ ya mma.

7Ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, nke e si Ijipt bubata, ka e ji mee ọkọlọtọ gị. Akwa ndo gị bụkwa akwa na-acha anụnụ anụnụ, na odo odo, nke e si nʼobodo ọnụ mmiri Elisha bubata.

8Ndị ikom si Saịdọn na Avad bụ ndị na-akwọrọ gị ụgbọ mmiri gị. Ndị ǹka ndị ikom gị, gị Taịa, nọ nʼụgbọ dịka ndị ọka nʼịkwọ ụgbọ mmiri.

9Ndị okenye na ndị nka Gebal a maara aha ha nọ nʼime ụgbọ mmiri gị. Ọrụ ha bụ imechisi oghere ọbụla dị nʼụgbọ ahụ. Ụgbọ mmiri niile na ndị na-anya ha na-abata nʼọnụ mmiri gị nʼihi ịzụ ihe ahịa gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.