Izikiel 28

Ahọpụtara m gị mee gị ka ị bụrụ cherub, ọrụ ahụ e doro gị iche ịrụ. Ọ bụ nʼugwu nsọ Chineke ka ị na-anọ, na-ejegharịkwa nʼetiti nkume ndị ahụ na-acha ọkụ.

Ezekiel 28:14 (UKJV) You are the anointed cherub that covers; and I have set you so: you were upon the holy mountain of God; you have walked up and down in the midst of the stones of fire.

12“Nwa nke mmadụ, bulie abụ akwa banyere eze Taịa ma gwa ya, ‘Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Gị onwe gị bụ akara izuoke, ị jupụtara na amamihe na ịma mma.

13Ị nọ nʼIden, nʼubi Chineke a gbara ogige. Nʼebe ahụ ka e ji nkume dị oke ọnụahịa ndị a chọọ gị mma, rubi, na topaazi, na emeralụdụ, na krisolaịt, na ọniks, na jaspa, na safaia, na tọkwọisi, na beril. A rụnyere nkume ndị a niile nʼime ọlaedo. Ọ bụkwa nʼụbọchị ahụ e kere gị ka e doziri ha.

14Ahọpụtara m gị mee gị ka ị bụrụ cherub, ọrụ ahụ e doro gị iche ịrụ. Ọ bụ nʼugwu nsọ Chineke ka ị na-anọ, na-ejegharịkwa nʼetiti nkume ndị ahụ na-acha ọkụ.

15Ị bụ onye na-enweghị ịta ụta nʼụzọ gị niile site nʼụbọchị e kere gị, tutu ruo mgbe a hụrụ ajọ omume nʼime gị.

16Site nʼịba ụba nke ọzụzụ ahịa gị ị ghọrọ onye na-eme ihe ike, si otu a mehiekwa. Nʼihi ya, esi m nʼugwu Chineke chụpụ gị, nʼihi adịghị nsọ gị. Esitekwara m nʼetiti nkume ọkụ ndị ahụ chụpụ gị, gị cherub na-ekpuchi ekpuchi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.