14Ahọpụtara m gị mee gị ka ị bụrụ cherub, ọrụ ahụ e doro gị iche ịrụ. Ọ bụ nʼugwu nsọ Chineke ka ị na-anọ, na-ejegharịkwa nʼetiti nkume ndị ahụ na-acha ọkụ.
15Ị bụ onye na-enweghị ịta ụta nʼụzọ gị niile site nʼụbọchị e kere gị, tutu ruo mgbe a hụrụ ajọ omume nʼime gị.
16Site nʼịba ụba nke ọzụzụ ahịa gị ị ghọrọ onye na-eme ihe ike, si otu a mehiekwa. Nʼihi ya, esi m nʼugwu Chineke chụpụ gị, nʼihi adịghị nsọ gị. Esitekwara m nʼetiti nkume ọkụ ndị ahụ chụpụ gị, gị cherub na-ekpuchi ekpuchi.
17Obi gị jupụtara na nganga nʼihi ịma mma gị, i mere ka amamihe gị bụrụ ihe rụrụ arụ nʼihi ebube nke ịma mma gị. Nʼihi ya, achụdara m gị, tụọ gị nʼala, mee ka ị bụrụ ihe nlere anya nye ndị eze niile.
18Nʼihi ọtụtụ mmehie gị, na ịzụ ahịa aghụghọ gị, i meela ka ụlọnsọ gị niile ghọọ ihe rụrụ arụ. Nʼihi ya, emere m ka ọkụ si nʼetiti gị pụta, repịa gị. Ka ị ghọọ ntụ nʼelu ala, nʼihu ndị ahụ niile na-ele gị anya.