2“Nwa nke mmadụ, gwa eze Taịa, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: “ ‘Nʼihi nganga nke juru gị obi, ị na-ekwu sị, “Mụ onwe m bụ chi, mụ onwe m na-anọkwasị nʼocheeze nke otu chi, nke dị nʼetiti oke osimiri niile.” Ma gị onwe gị bụ mmadụ efu, ị bụghị chi, ọ bụ ezie na ị na-eche na ị mara ihe dịka chi.
3Ị maara ihe karịa Daniel? Ọ bụ na o nweghị ihe e zoro ezo nʼebe ị nọ?
4I werela amamihe gị na nghọta gị nwetara onwe gị akụ, tụkọba ọlaedo na ọlaọcha, nʼime ụlọakụ gị dị iche iche.
5E, mmụta nʼịzụ ahịa gị emeela ka ị ghọọ ọgaranya, nʼihi akụnụba inwere ị bụrụla onye na-akpa nganga.
6“ ‘Ya mere, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu; “ ‘ebe ọ bụ na ị gụrụ onwe gị dịka onye maara ihe onye maara ihe dịka chi,