Izikiel 28

“Nwa nke mmadụ, gwa eze Taịa, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: “ ‘Nʼihi nganga nke juru gị obi, ị na-ekwu sị, “Mụ onwe m bụ chi, mụ onwe m na-anọkwasị nʼocheeze nke otu chi, nke dị nʼetiti oke osimiri niile.” Ma gị onwe gị bụ mmadụ efu, ị bụghị chi, ọ bụ ezie na ị na-eche na ị mara ihe dịka chi.

Ezekiel 28:2 (UKJV) Son of man, say unto the prince of Tyrus, Thus says the Lord GOD; Because yours heart is lifted up, and you have said, I am a God, I sit in the seat of God, in the midst of the seas; yet you are a man, and not God, though you set yours heart as the heart of God:

1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

2“Nwa nke mmadụ, gwa eze Taịa, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: “ ‘Nʼihi nganga nke juru gị obi, ị na-ekwu sị, “Mụ onwe m bụ chi, mụ onwe m na-anọkwasị nʼocheeze nke otu chi, nke dị nʼetiti oke osimiri niile.” Ma gị onwe gị bụ mmadụ efu, ị bụghị chi, ọ bụ ezie na ị na-eche na ị mara ihe dịka chi.

3Ị maara ihe karịa Daniel? Ọ bụ na o nweghị ihe e zoro ezo nʼebe ị nọ?

4I werela amamihe gị na nghọta gị nwetara onwe gị akụ, tụkọba ọlaedo na ọlaọcha, nʼime ụlọakụ gị dị iche iche.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.