1Nʼafọ nke iri, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke iri na abụọ, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
2“Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼIjipt buo amụma megide Fero bụ eze Ijipt, na ala Ijipt niile.
3Gwa ya okwu, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: “ ‘Lee, mụ onwe m na-emegide gị, Fero eze Ijipt, gị onye bụ ogologo anụ ọjọọ ahụ na-amakpu nʼetiti mmiri iyi. Nʼihi na ị sịrị, “Ọ bụ m nwe Naịl, ọ bụkwa mụ onwe m mere ya nye onwe m.”
4Ma aga m etinye nko nʼagba gị, mee ka azụ niile nke iyi gị niile rapara nʼakpịrịkpa gị. Aga m adọpụta gị site nʼetiti iyi gị niile, mee ka azụ niile rapara nʼakpịrịkpa gị.