Izikiel 29

Gwa ya okwu, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: “ ‘Lee, mụ onwe m na-emegide gị, Fero eze Ijipt, gị onye bụ ogologo anụ ọjọọ ahụ na-amakpu nʼetiti mmiri iyi. Nʼihi na ị sịrị, “Ọ bụ m nwe Naịl, ọ bụkwa mụ onwe m mere ya nye onwe m.”

Ezekiel 29:3 (UKJV) Speak, and say, Thus says the Lord GOD; Behold, I am against you, Pharaoh king of Egypt, the great dragon that lies in the midst of his rivers, which has said, My river is mine own, and I have made it for myself.

1Nʼafọ nke iri, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke iri na abụọ, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

2“Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼIjipt buo amụma megide Fero bụ eze Ijipt, na ala Ijipt niile.

3Gwa ya okwu, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: “ ‘Lee, mụ onwe m na-emegide gị, Fero eze Ijipt, gị onye bụ ogologo anụ ọjọọ ahụ na-amakpu nʼetiti mmiri iyi. Nʼihi na ị sịrị, “Ọ bụ m nwe Naịl, ọ bụkwa mụ onwe m mere ya nye onwe m.”

4Ma aga m etinye nko nʼagba gị, mee ka azụ niile nke iyi gị niile rapara nʼakpịrịkpa gị. Aga m adọpụta gị site nʼetiti iyi gị niile, mee ka azụ niile rapara nʼakpịrịkpa gị.

5Aga m ahapụ gị na azụ niile nke osimiri iyi gị nʼọzara, ebe ahụ ka unu ga-anọ nwụọ nʼala ubi, a gaghị eli unu eli maọbụ tụtụọ unu, nʼihi na emeela m ka unu bụrụ nri nye anụ ọhịa niile, na nnụnụ niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.