Izikiel 3

Ma ọ bụrụ na ị dọọ onye ezi omume aka na ntị ka ọ ghara ime mmehie, ha gharakwa ime mmehie, ha ga-adị ndụ nʼihi na ha nabatara ịdọ aka na ntị ahụ. Gị onwe gị azọpụtakwala ndụ gị, nʼụzọ dị otu a.”

Ezekiel 3:21 (UKJV) Nevertheless if you warn the righteous man, that the righteous sin not, and he does not sin, he shall surely live, because he is warned; also you have delivered your soul.

19Ma ọ bụrụ na ị dọọ onye ajọ omume aka na ntị, ma ha esighị nʼajọ omume maọbụ nʼụzọ ọjọọ ha niile chigharịa, ha ga-anwụ nʼihi mmehie, ma ndụ gị ka ị zọpụtara.

20“Ma ọ bụrụ na onye ezi omume esite nʼụzọ ezi omume ya wezuga onwe ya bido ime ihe ọjọọ, m siere ha ọnya, ha ga-anwụ nʼihi na ị dọghị ha aka na ntị, ha ga-anwụ nʼihi mmehie ha. Agaghịkwa echeta ihe ọma niile ndị ha mere, ma ị ga-aza ajụjụ maka ọnwụ ha.

21Ma ọ bụrụ na ị dọọ onye ezi omume aka na ntị ka ọ ghara ime mmehie, ha gharakwa ime mmehie, ha ga-adị ndụ nʼihi na ha nabatara ịdọ aka na ntị ahụ. Gị onwe gị azọpụtakwala ndụ gị, nʼụzọ dị otu a.”

22Aka Onyenwe anyị dịgidesịrị ike nʼahụ m nʼebe ahụ. Ma ọ sịrị m, “Bilie gaa nʼebe ahụ obosara ala dị ka m gwa gị okwu nʼebe ahụ,”

23Ebiliri m gaa nʼebe ahụ ala dị larịị. Ebube Onyenwe anyị guzo nʼebe ahụ dịka ebube nke m hụrụ nʼakụkụ iyi Keba. Adara m kpuo ihu m nʼala.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.