22Aka Onyenwe anyị dịgidesịrị ike nʼahụ m nʼebe ahụ. Ma ọ sịrị m, “Bilie gaa nʼebe ahụ obosara ala dị ka m gwa gị okwu nʼebe ahụ,”
23Ebiliri m gaa nʼebe ahụ ala dị larịị. Ebube Onyenwe anyị guzo nʼebe ahụ dịka ebube nke m hụrụ nʼakụkụ iyi Keba. Adara m kpuo ihu m nʼala.
24Mgbe ahụ, Mmụọ ahụ banyere nʼime m mee ka m guzo ọtọ nʼụkwụ m abụọ. Ọ gwara m okwu sị m, “Gaa, baa nʼụlọ, mechibido onwe gị ụzọ.
25Ma gị, nwa nke mmadụ, a ga-eji ụdọ kee gị ka ị ghara inwe ike ịpụ gaa nʼetiti ndị mmadụ.
26Aga m eme ka ire gị rapara nʼakpo ọnụ gị, ka ị ghọọ onye ogbi, gharakwa ịbụ onye na-adọ ha aka na ntị, nʼihi na ha bụ ndị na-enupu isi.