23Ebiliri m gaa nʼebe ahụ ala dị larịị. Ebube Onyenwe anyị guzo nʼebe ahụ dịka ebube nke m hụrụ nʼakụkụ iyi Keba. Adara m kpuo ihu m nʼala.
24Mgbe ahụ, Mmụọ ahụ banyere nʼime m mee ka m guzo ọtọ nʼụkwụ m abụọ. Ọ gwara m okwu sị m, “Gaa, baa nʼụlọ, mechibido onwe gị ụzọ.
25Ma gị, nwa nke mmadụ, a ga-eji ụdọ kee gị ka ị ghara inwe ike ịpụ gaa nʼetiti ndị mmadụ.
26Aga m eme ka ire gị rapara nʼakpo ọnụ gị, ka ị ghọọ onye ogbi, gharakwa ịbụ onye na-adọ ha aka na ntị, nʼihi na ha bụ ndị na-enupu isi.
27Ma mgbe ọbụla m ziri gị ozi, aga m atọghepụ ire gị. Ị ga-asịkwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru.’ Ka onye nwere ntị nụrụ, ka onye nke na-achọghị ịnụ ghara ịnụ, nʼihi na ha bụ ndị na-enupu isi.