4Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, bilie jekwuru ụmụ Izrel gwa ha okwu m niile.
5Nʼihi na-ezighị m gị ka i jekwuru mba ndị okwu ha edoghị anya na ndị a naghị aghọta asụsụ ha, kama ọ bụ ijekwuru ụlọ Izrel.
6Ezikwaghị m gị ka i jekwuru mba nwere asụsụ na-edoghị anya, nke ị na-adịghị aghọta okwu ha. Nʼihi na a sị na ọ bụ ndị dị otu a ka m zigara gị ka i jekwuru, ha gaara ege gị ntị.
7Ma ụlọ Izrel agaghị ekwe gee gị ntị, nʼihi na ha jụrụ ige m ntị. Nʼihi na ụlọ Izrel bụ ndị obi ha siri ike, na ndị isiike.
8Lee, emeela m ka ihu gị sie ike karịa nke ha, ka egedege ihu gị siekwa ike karịa nke ha.