Izikiel 3

Lee, emeela m ka ihu gị sie ike karịa nke ha, ka egedege ihu gị siekwa ike karịa nke ha.

Ezekiel 3:8 (UKJV) Behold, I have made your face strong against their faces, and your forehead strong against their foreheads.

6Ezikwaghị m gị ka i jekwuru mba nwere asụsụ na-edoghị anya, nke ị na-adịghị aghọta okwu ha. Nʼihi na a sị na ọ bụ ndị dị otu a ka m zigara gị ka i jekwuru, ha gaara ege gị ntị.

7Ma ụlọ Izrel agaghị ekwe gee gị ntị, nʼihi na ha jụrụ ige m ntị. Nʼihi na ụlọ Izrel bụ ndị obi ha siri ike, na ndị isiike.

8Lee, emeela m ka ihu gị sie ike karịa nke ha, ka egedege ihu gị siekwa ike karịa nke ha.

9Aga m emekwa ka egedege ihu gị dị ka nkume siri ike, sie ike karịa nkume. Nʼihi ya, atụla ha egwu; ọ bụ ezie na ha bụ ndị na-enupu isi, ma atụla ihu ha egwu.”

10Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, gee ntị nke ọma nʼokwu ndị a niile m na-agwa gị, tinyekwa ha nʼuche gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.