12Aga m eme ka osimiri Naịl taa. Ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ. Aga m ewerekwa ala ahụ resi mba ndị ọjọọ. Aga m ala ala ahụ na ihe niile dị nʼime ya nʼiyi. Ọ bụkwa ndị mba ọzọ ka m ga-eji mee ya. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya.
13“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “ ‘M ga-ala arụsị niile nʼiyi, mekwaa ka ihe niile a kpụrụ akpụ dị na Memfis kwụsị. Onye eze agakwaghị adị ọzọ nʼIjipt, aga m emekwa ka egwu jupụta nʼala ahụ niile.
14Aga m emekwa ka Patros tọgbọrọ nʼefu. Aga m etinye ọkụ na Zoan, ma taa Tibs ahụhụ.
15M ga-awụkwasị Pelusium ọnụma m, bụ ebe siri ike nke Ijipt, m ga-ebipụkwa igwe ndị Tibs niile.
16Aga m amụnye ọkụ nʼIjipt, Pelusium ga-anọ nʼoke ihe mgbu. A ga-eji ike tipịa Tibs. Memfis ga-anọgidekwa nʼọnọdụ ọjọọ ụbọchị niile.