Izikiel 30

Aga m amụnye ọkụ nʼIjipt, Pelusium ga-anọ nʼoke ihe mgbu. A ga-eji ike tipịa Tibs. Memfis ga-anọgidekwa nʼọnọdụ ọjọọ ụbọchị niile.

Ezekiel 30:16 (UKJV) And I will set fire in Egypt: Sin shall have great pain, and No shall be rent asunder, and Noph shall have distresses daily.

14Aga m emekwa ka Patros tọgbọrọ nʼefu. Aga m etinye ọkụ na Zoan, ma taa Tibs ahụhụ.

15M ga-awụkwasị Pelusium ọnụma m, bụ ebe siri ike nke Ijipt, m ga-ebipụkwa igwe ndị Tibs niile.

16Aga m amụnye ọkụ nʼIjipt, Pelusium ga-anọ nʼoke ihe mgbu. A ga-eji ike tipịa Tibs. Memfis ga-anọgidekwa nʼọnọdụ ọjọọ ụbọchị niile.

17Ụmụ okorobịa Heliopolis na Bubasti ga-anwụ site na mma agha. Obodo ndị a niile ga-abụkwa ndị a dọtara nʼagha.

18Ụbọchị ahụ ga-agba ọchịchịrị na Tapanhis mgbe m ga-agbaji yoku Ijipt, nʼebe ahụ ka mpako nke ike ya ga-agwụsị. Igwe ojii ga-ekpuchi ya, a ga-adọtakwa obodo nta ya niile nʼagha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.