Izikiel 30

M ga-awụkwasị Pelusium ọnụma m, bụ ebe siri ike nke Ijipt, m ga-ebipụkwa igwe ndị Tibs niile.

Ezekiel 30:15 (UKJV) And I will pour my fury upon Sin, the strength of Egypt; and I will cut off the multitude of No.

13“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “ ‘M ga-ala arụsị niile nʼiyi, mekwaa ka ihe niile a kpụrụ akpụ dị na Memfis kwụsị. Onye eze agakwaghị adị ọzọ nʼIjipt, aga m emekwa ka egwu jupụta nʼala ahụ niile.

14Aga m emekwa ka Patros tọgbọrọ nʼefu. Aga m etinye ọkụ na Zoan, ma taa Tibs ahụhụ.

15M ga-awụkwasị Pelusium ọnụma m, bụ ebe siri ike nke Ijipt, m ga-ebipụkwa igwe ndị Tibs niile.

16Aga m amụnye ọkụ nʼIjipt, Pelusium ga-anọ nʼoke ihe mgbu. A ga-eji ike tipịa Tibs. Memfis ga-anọgidekwa nʼọnọdụ ọjọọ ụbọchị niile.

17Ụmụ okorobịa Heliopolis na Bubasti ga-anwụ site na mma agha. Obodo ndị a niile ga-abụkwa ndị a dọtara nʼagha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.