2“Nwa nke mmadụ, buo amụma sịkwa, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, “ ‘Kwasienụ akwa ike ma sị, “Ewoo, nʼihi ụbọchị ahụ!”
3Nʼihi nʼụbọchị ahụ adịla nso, Ụbọchị nke Onyenwe anyị abịala nso, ụbọchị igwe ojii, ụbọchị ga-ewetara mba dị iche iche mbibi.
4Mma agha ga-abịakwasị Ijipt, ihe mgbu ga-adakwasị Kush. Mgbe ndị e gburu egbu ga-abụ aja dị nʼala, a ga-ekpokọrọkwa akụnụba ya, mebikwaa ntọala ya. Ala ya ga-abụkwa ihe e bibiri ebibi.
5Kush na Libiya, Lidiya na ndị Arebịa niile gwara ọgwa, Kub na ndị mba ọgbụgba ndụ ahụ, na Ijipt ga-eso daa site na mma agha.
6“ ‘Ọ bụ ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: “ ‘Ndị niile na-akwagide Ijipt ga-ada, nganga niile nke ike ya ga-agwụsịkwa. Site na Migdol ruo nʼAswan, ọ bụ site na mma agha ka ha ga-ada nʼime ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.