Izikiel 30

“ ‘Ọ bụ ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: “ ‘Ndị niile na-akwagide Ijipt ga-ada, nganga niile nke ike ya ga-agwụsịkwa. Site na Migdol ruo nʼAswan, ọ bụ site na mma agha ka ha ga-ada nʼime ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.

Ezekiel 30:6 (UKJV) Thus says the LORD; They also that uphold Egypt shall fall; and the pride of her power shall come down: from the tower of Syene shall they fall in it by the sword, says the Lord GOD.

4Mma agha ga-abịakwasị Ijipt, ihe mgbu ga-adakwasị Kush. Mgbe ndị e gburu egbu ga-abụ aja dị nʼala, a ga-ekpokọrọkwa akụnụba ya, mebikwaa ntọala ya. Ala ya ga-abụkwa ihe e bibiri ebibi.

5Kush na Libiya, Lidiya na ndị Arebịa niile gwara ọgwa, Kub na ndị mba ọgbụgba ndụ ahụ, na Ijipt ga-eso daa site na mma agha.

6“ ‘Ọ bụ ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: “ ‘Ndị niile na-akwagide Ijipt ga-ada, nganga niile nke ike ya ga-agwụsịkwa. Site na Migdol ruo nʼAswan, ọ bụ site na mma agha ka ha ga-ada nʼime ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.

7Ha ga-atọgbọrọ nʼefu, nʼetiti ala niile tọgbọrọ nʼefu. Obodo ha niile ga-abụ mkpọmkpọ ebe, nʼetiti ọtụtụ obodo e bibiri ebibi.

8Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m tinyesịrị ọkụ nʼIjipt, mgbe m gwepịara ndị niile na-enyere ya aka.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.