Izikiel 31

“ ‘Olee osisi dị nʼIden a ga-eji tụnyere gị nʼịma mma, na nʼịdị ebube? Ma gị onwe gị kwa, na osisi ndị a niile dị nʼIden ka a ga-eme ka unu rịdaruo nʼokpuru ụwa. Ị ga-edina nʼetiti ndị a na-ebighị ugwu, gị na ndị eji mma agha gbuo. “ ‘Nke a bụ Fero na usuu ndị agha ya niile, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’ ”

Ezekiel 31:18 (UKJV) To whom are you thus like in glory and in greatness among the trees of Eden? yet shall you be brought down with the trees of Eden unto the nether parts of the earth: you shall lie in the midst of the uncircumcised with them that be slain by the sword. This is Pharaoh and all his multitude, says the Lord GOD.

16Emere m ka mba niile maa jijiji nʼegwu nʼihi ọdịda ya, mgbe m tụnyere ya na ndị ahụ na-aga nʼolulu nʼime ala mmụọ. Mgbe ahụ, a kasịrị osisi niile mara mma obi, bụ osisi ndị ahụ dị nʼogige Iden, na osisi ọma niile nke Lebanọn, ndị nke mgbọrọgwụ ha na-enweta mmiri nke ọma.

17Ha onwe ha kwa, dịka sida ukwuu ahụ, sokwaara gbadaruo nʼala mmụọ, gakwuru ndị niile eji mma agha gbuo, ha na ndị ikom ji mma agha bụ ndị biri nʼokpuru ndo ya nʼetiti mba dị iche iche.

18“ ‘Olee osisi dị nʼIden a ga-eji tụnyere gị nʼịma mma, na nʼịdị ebube? Ma gị onwe gị kwa, na osisi ndị a niile dị nʼIden ka a ga-eme ka unu rịdaruo nʼokpuru ụwa. Ị ga-edina nʼetiti ndị a na-ebighị ugwu, gị na ndị eji mma agha gbuo. “ ‘Nke a bụ Fero na usuu ndị agha ya niile, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.