1Nʼafọ nke iri na abụọ, nʼọnwa nke iri na abụọ, nʼụbọchị nke mbụ ya, okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị, sị,
2“Nwa nke mmadụ, buliere Fero bụ eze Ijipt, abụ akwa sị ya, “ ‘Ị dị ka ọdụm nʼetiti mba niile. Ị dịkwa ka ogologo anụ ọjọọ na-anọ nʼosimiri. I na-akpụgharị onwe gị nʼime mmiri. I ji ụkwụ abụọ na-agbarụ mmiri, na-emekwa ka mmiri iyi niile gbarụọ.
3“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, “ ‘Aga m eji ọtụtụ ndị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ gbasaa ụgbụ m nʼelu gị. Ha ga-adọkpụkwara gị nʼime ụgbụ m.