9Aga m eweta obi mgbawa nʼetiti ndị mmadụ dị iche iche mgbe m ga-eme ka mbibi gị bịa nʼetiti mba niile nʼime ala dị iche iche nke ị na-amaghị.
10Aga m eme ka i ju ọtụtụ ndị mmadụ anya, ndị eze ha ga-ama jijiji nʼụjọ maka gị mgbe m ga-efegharị mma agha m nʼihu ha. Onye ọbụla nʼime ha ga-ama jijiji na ntabi anya ọbụla nʼihi ndụ ya nʼụbọchị ahụ, ị ga-ada.
11“ ‘Nʼihi na nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Mma agha nke eze Babilọn ga-abịakwasị gị.
12Usuu ndị agha gị ga-adakwa nʼihu mma agha nke ndị dị ike, bụ ndị mba ahụ kachasị mba niile njọ. Nganga niile nke Ijipt na ndị ya, ka ha ga-egwepịa. Ha ga-akwatu usuu ndị agha ha niile.
13Aga m emekwa ka anụmanụ ya niile, nke na-ata ahịhịa nʼakụkụ mmiri laa nʼiyi. Ụkwụ mmadụ, na ụkwụ anụmanụ agakwaghị agbarụ mmiri ahụ ọzọ.