Izikiel 32

E meere ya ebe ndina nʼetiti ndị nwụrụ anwụ. Igwe mmadụ ya nwụrụ anwụ gbakwara ili ya gburugburu. Ha niile bụ ndị a na-ebighị ugwu, ndị e ji mma agha gbuo, nʼihi na-emere ka oke egwu ha dị nʼala ndị dị ndụ, ma ha na-eburu ihere ha, ha na ndị ahụ na-arịdaru nʼolulu. Ha bụ ndị e debere nʼetiti ndị nwụrụ anwụ.

Ezekiel 32:25 (UKJV) They have set her a bed in the midst of the slain with all her multitude: her graves are round about him: all of them uncircumcised, slain by the sword: though their terror was caused in the land of the living, yet have they borne their shame with them that go down to the pit: he is put in the midst of them that be slain.

23Ili ha dị na nsọtụ niile nke olulu, ndị agha ya niile gbakwara ili ya gburugburu. E gbudala ndị niile mere ka oke egwu dị nʼala ndị dị ndụ. Ndị a nwụrụ site na mma agha.

24“Nʼebe ahụ ka Elam na usuu ndị agha ya nọ gbaa ili ya gburugburu. Ha niile bụ ndị e gburu egbu, ndị nwụrụ site na mma agha. Ndị niile mere ka oke egwu dị nʼala ndị dị ndụ arịdaruola nʼolulu ahụ dịka ndị a na-ebighị ugwu. Ha esorola ndị ahụ rịdaruru nʼala mmụọ keta oke nʼihere dịrị ha.

25E meere ya ebe ndina nʼetiti ndị nwụrụ anwụ. Igwe mmadụ ya nwụrụ anwụ gbakwara ili ya gburugburu. Ha niile bụ ndị a na-ebighị ugwu, ndị e ji mma agha gbuo, nʼihi na-emere ka oke egwu ha dị nʼala ndị dị ndụ, ma ha na-eburu ihere ha, ha na ndị ahụ na-arịdaru nʼolulu. Ha bụ ndị e debere nʼetiti ndị nwụrụ anwụ.

26“Meshek na Tubal nọkwa nʼebe ahụ, ha na usuu ndị agha ha niile, gburugburu ili ha. Ha niile bụkwa ndị a na-ebighị ugwu, ndị e ji mma agha gbuo, nʼihi na ha mere ka oke egwu ha dị nʼala ndị dị ndụ.

27Ugbu a, e likọọla ha na ndị a na-ebighị ugwu, bụ ndị dike nʼagha, ndị nwụrụ anwụ, ndị ji ngwa agha ha gbadaa nʼime ili ha, ndị e hinyere ngwa agha ha nʼokpuru isi ha, ebe ọta ha dịkwasịrị nʼọkpụkpụ mgbe e tinyere ha nʼili. Ma nʼezie, ndị a bụ dike nʼagha mere ka oke egwu dị nʼala ndị dị ndụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.