4Aga m atụsa gị nʼala, nʼọhịa ka m ga-atụfukwa gị, meekwa ka ụmụ nnụnụ niile nke eluigwe bekwasị gị. Aga m emekwa ka anụ ọhịa nke ụwa niile rijuo afọ nʼanụ ahụ gị.
5Aga m tụsasịkwa anụ ahụ gị nʼugwu niile, werekwa ihe ọbụla fọdụrụ nʼime gị mejuo ndagwurugwu niile.
6M ga-eji ọbara gị na-asọ asọ dee ala niile dịka mmiri ọ bụladị ruo nʼugwu niile, ebe niile mmiri si erufe ga-ejupụtakwa nʼanụ ahụ gị.
7Mgbe m ga-emenyụ gị dịka ọkụ, aga m ekpuchi ihu eluigwe, meekwa ka kpakpando niile jie nji. Aga m eji igwe ojii mechie ihu anyanwụ, ọnwa agakwaghị enye ìhè ya.
8Ihe niile nke na-enye ìhè nʼeluigwe ka m ga-eme ka ha jie nji nʼelu gị, mee ka ọchịchịrị gbachie nʼala gị niile, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.