9Ị gaghị ebulitekwa isi gị ọzọ. Ebe tọgbọrọ nʼefu ka ị ga-abụ ruo ebighị ebi. A gaghị ewuzikwa obodo gị ọzọ. Ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
10“ ‘Nʼihi na ị sịrị, “Mba abụọ ndị a, na ala abụọ ndị a ga-abụ nke anyị, anyị ga-enweta ha,” nʼagbanyeghị na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị nọ nʼebe ahụ.
11Nʼihi ya, ebe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, aga m emeso gị mmeso dịka ịba ụba nke iwe gị na ekworo gị si dị, bụ nke i gosiri mgbe ị kpọrọ ha asị. Aga m emekwa ka ha mata onye m bụ, mgbe m kpesịrị gị ikpe.
12Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị nụrụ okwu ọjọọ ndị ahụ niile i kwuru megide ugwu Izrel niile, na-asị, “E meela ha ebe tọgbọrọ nʼefu, ewerela ha nyefee anyị nʼaka ka anyị dọgbuo ha.”
13Unu nyakwara isi megide m, kwuo okwu kwugide m dịka o si dị unu mma. Anụkwara m ihe niile unu kwuru.