Izikiel 35

Ị gaghị ebulitekwa isi gị ọzọ. Ebe tọgbọrọ nʼefu ka ị ga-abụ ruo ebighị ebi. A gaghị ewuzikwa obodo gị ọzọ. Ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.

Ezekiel 35:9 (UKJV) I will make you perpetual desolations, and your cities shall not return: and all of you shall know that I am the LORD.

7Aga m eme ka ugwu Sia ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Aga m esitekwa nʼime ya bipụ ndị na-abata abata, na ndị na-apụ apụ.

8Ugwu ukwu gị niile ga-ejupụta nʼozu ndị nwụrụ anwụ, ugwu nta niile, na ndagwurugwu niile na mgbawara niile dị nʼala ga-ejupụta nʼozu ndị e ji mma agha gbuo.

9Ị gaghị ebulitekwa isi gị ọzọ. Ebe tọgbọrọ nʼefu ka ị ga-abụ ruo ebighị ebi. A gaghị ewuzikwa obodo gị ọzọ. Ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.

10“ ‘Nʼihi na ị sịrị, “Mba abụọ ndị a, na ala abụọ ndị a ga-abụ nke anyị, anyị ga-enweta ha,” nʼagbanyeghị na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị nọ nʼebe ahụ.

11Nʼihi ya, ebe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, aga m emeso gị mmeso dịka ịba ụba nke iwe gị na ekworo gị si dị, bụ nke i gosiri mgbe ị kpọrọ ha asị. Aga m emekwa ka ha mata onye m bụ, mgbe m kpesịrị gị ikpe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.