Izikiel 35

Ugwu ukwu gị niile ga-ejupụta nʼozu ndị nwụrụ anwụ, ugwu nta niile, na ndagwurugwu niile na mgbawara niile dị nʼala ga-ejupụta nʼozu ndị e ji mma agha gbuo.

Ezekiel 35:8 (UKJV) And I will fill his mountains with his slain men: in your hills, and in your valleys, and in all your rivers, shall they fall that are slain with the sword.

6Nʼihi nke a, ebe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, aga m enyefe gị nʼaka ndị na-awụsi ọbara. Ọbara ga-achụkwa gị ọsọ. Ebe ọ bụ na ị kpọghị iwusi ọbara asị, ọbara a ga-awụsị nʼime gị ga-achụ gị ọsọ.

7Aga m eme ka ugwu Sia ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Aga m esitekwa nʼime ya bipụ ndị na-abata abata, na ndị na-apụ apụ.

8Ugwu ukwu gị niile ga-ejupụta nʼozu ndị nwụrụ anwụ, ugwu nta niile, na ndagwurugwu niile na mgbawara niile dị nʼala ga-ejupụta nʼozu ndị e ji mma agha gbuo.

9Ị gaghị ebulitekwa isi gị ọzọ. Ebe tọgbọrọ nʼefu ka ị ga-abụ ruo ebighị ebi. A gaghị ewuzikwa obodo gị ọzọ. Ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.

10“ ‘Nʼihi na ị sịrị, “Mba abụọ ndị a, na ala abụọ ndị a ga-abụ nke anyị, anyị ga-enweta ha,” nʼagbanyeghị na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị nọ nʼebe ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.