26Aga m enye unu obi ọhụrụ, kenyekwa unu mmụọ ọhụrụ. Aga m ewepụ obi nkume nke mmehie dị nʼime unu, nye unu mkpụrụobi nke anụ ahụ.
27Aga m etinyekwa mmụọ m nʼime unu, mee ka unu gbaso ụkpụrụ m niile ma lezie anya mekwaa ihe niile m nyere nʼiwu.
28Unu ga-ebikwa nʼala ahụ nke m nyere nna unu ha. Unu ga-abụ ndị m, aga m abụkwa Chineke unu.
29Aga m azọpụta unu site na-adịghị ọcha unu niile. M ga-akpọ mkpụrụ ubi, mee ka o rie nne nke ukwu, agaghị m emekwa ka ụnwụ dakwasị unu ọzọ.
30Aga m emekwa ka mkpụrụ osisi na ihe owuwe ubi baa ụba nke ukwuu, ka unu gharakwa ịnata ihere ọzọ nʼihi ụnwụ, nʼetiti mba niile dị iche iche.