28Unu ga-ebikwa nʼala ahụ nke m nyere nna unu ha. Unu ga-abụ ndị m, aga m abụkwa Chineke unu.
29Aga m azọpụta unu site na-adịghị ọcha unu niile. M ga-akpọ mkpụrụ ubi, mee ka o rie nne nke ukwu, agaghị m emekwa ka ụnwụ dakwasị unu ọzọ.
30Aga m emekwa ka mkpụrụ osisi na ihe owuwe ubi baa ụba nke ukwuu, ka unu gharakwa ịnata ihere ọzọ nʼihi ụnwụ, nʼetiti mba niile dị iche iche.
31Mgbe ahụ, unu ga-echeta ụzọ ọjọọ unu niile na omume ọjọọ unu niile, unu ga-asọkwa onwe unu oyi nʼihi mmehie unu na ihe arụ niile unu mere.
32Ma achọrọ m ka unu mata na ọ bụghị nʼihi mma unu ka m ji na-eme ihe ndị a. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. Unu ụlọ Izrel, ihere kwesiri ime unu nʼihi omume ọjọọ unu mere.