2Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ndị iro unu ekwuola megide unu sị, “Ahaa! Ebe niile dị elu nke mgbe ochie aghọọla ihe nnweta anyị.” ’
3Nʼihi ya, buo amụma sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼihi na ha emeela ka unu tọgbọrọ nʼefu, chụgharịa unu ọsọ nʼakụkụ niile, mekwaa ka unu ghọọrọ mba niile ihe nnweta, ma meekwa ka unu bụrụ ndị a na-ekwujọ, na ndị a na-akọcha,
4nʼihi ya, unu ugwu niile nke Izrel, nụrụnụ okwu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-agwa ugwu ukwuu na ugwu nta niile, na mgbawara niile dị nʼala, na ndagwurugwu niile, na ebe niile tọgbọrọ nʼefu, na obodo ndị ahụ niile ndị mmadụ na-ebighị nʼime ya, nke ndị mba ọzọ kwakọọrọ ihe dị ha nʼime, ma jirikwa ha na-eme ihe ọchị.
5Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nke obi m ka m ji kwuo okwu megide mba ndị ọzọ, ma megidekwa Edọm, nʼihi na ọ bụ site nʼịkpọ asị nke obi ha ka ha ji mee ka ala m bụrụ ihe nnweta ha, ka ha si otu a kposaa, ma chịkọrọkwa ihe niile dị nʼebe ịta nri nke anụ ụlọ ala ahụ.’
6Nʼihi nke a, buo amụma banyere Izrel, gwa ugwu ukwu ya na ugwu nta ya niile, na mgbawara ala ya, na ndagwurugwu ya niile, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, ọ bụ site nʼọnụma nke ekworo ka m ji ekwu okwu ndị a, nʼihi na unu ahụọla ahụhụ site na nlelị ndị mba ọzọ na-elelị unu.