1“Nwa nke mmadụ, buo amụma nye ugwu niile dị nʼIzrel, na-asị ha, ‘Ugwu niile nke Izrel, nụrụnụ okwu nke Onyenwe anyị.
2Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ndị iro unu ekwuola megide unu sị, “Ahaa! Ebe niile dị elu nke mgbe ochie aghọọla ihe nnweta anyị.” ’
3Nʼihi ya, buo amụma sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼihi na ha emeela ka unu tọgbọrọ nʼefu, chụgharịa unu ọsọ nʼakụkụ niile, mekwaa ka unu ghọọrọ mba niile ihe nnweta, ma meekwa ka unu bụrụ ndị a na-ekwujọ, na ndị a na-akọcha,
4nʼihi ya, unu ugwu niile nke Izrel, nụrụnụ okwu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-agwa ugwu ukwuu na ugwu nta niile, na mgbawara niile dị nʼala, na ndagwurugwu niile, na ebe niile tọgbọrọ nʼefu, na obodo ndị ahụ niile ndị mmadụ na-ebighị nʼime ya, nke ndị mba ọzọ kwakọọrọ ihe dị ha nʼime, ma jirikwa ha na-eme ihe ọchị.
5Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nke obi m ka m ji kwuo okwu megide mba ndị ọzọ, ma megidekwa Edọm, nʼihi na ọ bụ site nʼịkpọ asị nke obi ha ka ha ji mee ka ala m bụrụ ihe nnweta ha, ka ha si otu a kposaa, ma chịkọrọkwa ihe niile dị nʼebe ịta nri nke anụ ụlọ ala ahụ.’