Izikiel 37

Ya mere, eburu m amụma dịka o si nye m nʼiwu. Ume ndụ banyekwara nʼime ha. Ha niile dịịrị ndụ, bilie ọtọ, guzo nʼụkwụ ha, ghọọ usuu ndị agha dị ukwuu nʼọnụọgụgụ.

Ezekiel 37:10 (UKJV) So I prophesied as he commanded me, and the breath came into them, and they lived, and stood up upon their feet, an exceeding great army.

8Mgbe m nọkwa na-ele anya, lee, ahụrụ m ka akwara na anụ ahụ malitere ịbịakwasị nʼelu ọkpụkpụ ndị ahụ, akpụkpọ ahụ kpuchikwara elu ha. Ma nʼoge a ume ọbụla adịghị nʼime ha.

9Mgbe ahụ, ọ sịrị m, “Buo amụma nye ifufe; buo amụma, nwa nke mmadụ, sị ifufe, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: site nʼakụkụ anọ nke ụwa bịa, gị ume na-enye ndụ, kukwasị ndị a e gburu egbu ka ha dịkwa ndụ ọzọ.’ ”

10Ya mere, eburu m amụma dịka o si nye m nʼiwu. Ume ndụ banyekwara nʼime ha. Ha niile dịịrị ndụ, bilie ọtọ, guzo nʼụkwụ ha, ghọọ usuu ndị agha dị ukwuu nʼọnụọgụgụ.

11Mgbe ahụ, ọ gwara m, “Nwa nke mmadụ, ọkpụkpụ ndị a nọchiri anya ụlọ Izrel niile. Ha na-asị, ‘Anyị aghọọla ọkpụkpụ kpọrọ nkụ, olileanya niile agwụkwala, anyị abụrụla ndị e bipụrụ.’

12Nʼihi ya, buo amụma gwa ha, ‘otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Ndị m, aga m emeghe ili unu, si nʼebe ahụ wepụta unu. Aga m eme ka unu lọghachitakwa nʼala Izrel.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.