Izikiel 38

Unu ga-abịa ibuso ndị m Izrel agha, kpuchie ala ha dịka igwe ojii. Nʼụbọchị ndị ahụ dị nʼihu, aga m eme ka gị, bụ Gog, bịa buso ala m agha, ka mba niile si otu a mata m, mgbe m mere ka ịdị nsọ m pụta ìhè nʼanya ha site nʼihe m ga-eme.’

Ezekiel 38:16 (UKJV) And you shall come up against my people of Israel, as a cloud to cover the land; it shall be in the latter days, and I will bring you against my land, that the heathen may know me, when I shall be sanctified in you, O Gog, before their eyes.

14“Nʼihi ya, nwa nke mmadụ, buo amụma sị Gog, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼụbọchị ahụ mgbe ndị m bụ Izrel na-ebi nʼudo nʼala ha, ọ bụ na ị gaghị ahụta ya?

15Ị ga-esi nʼebe obibi gị dị nʼugwu bịa, gị na ọtụtụ mba dị iche iche, ndị na-anọkwasị nʼịnyịnya. Ha ga-adị ukwuu, bụrụ ndị agha dị ike.

16Unu ga-abịa ibuso ndị m Izrel agha, kpuchie ala ha dịka igwe ojii. Nʼụbọchị ndị ahụ dị nʼihu, aga m eme ka gị, bụ Gog, bịa buso ala m agha, ka mba niile si otu a mata m, mgbe m mere ka ịdị nsọ m pụta ìhè nʼanya ha site nʼihe m ga-eme.’

17“ ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ọ bụ gị, bụ onye ahụ m kwuru okwu banyere ya nʼoge gara aga, site nʼọnụ ndị ohu m, bụ ndị amụma Izrel, ndị buru amụma ọtụtụ afọ na mgbe ahụ, sị, na m ga-eme ka ị megide ndị m.

18Lee ihe ga-eme nʼụbọchị ahụ. Mgbe Gog busoro ala Izrel agha, ọ ga-esi otu a kpalie iwe m dị ọkụ. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.