15Ị ga-esi nʼebe obibi gị dị nʼugwu bịa, gị na ọtụtụ mba dị iche iche, ndị na-anọkwasị nʼịnyịnya. Ha ga-adị ukwuu, bụrụ ndị agha dị ike.
16Unu ga-abịa ibuso ndị m Izrel agha, kpuchie ala ha dịka igwe ojii. Nʼụbọchị ndị ahụ dị nʼihu, aga m eme ka gị, bụ Gog, bịa buso ala m agha, ka mba niile si otu a mata m, mgbe m mere ka ịdị nsọ m pụta ìhè nʼanya ha site nʼihe m ga-eme.’
17“ ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ọ bụ gị, bụ onye ahụ m kwuru okwu banyere ya nʼoge gara aga, site nʼọnụ ndị ohu m, bụ ndị amụma Izrel, ndị buru amụma ọtụtụ afọ na mgbe ahụ, sị, na m ga-eme ka ị megide ndị m.
18Lee ihe ga-eme nʼụbọchị ahụ. Mgbe Gog busoro ala Izrel agha, ọ ga-esi otu a kpalie iwe m dị ọkụ. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.
19Nʼihi na esitere m nʼịnụ ọkụ nke obi m, na oke iwe m kwupụta sị, na ala ọma jijiji dị ukwuu ga-adị nʼIzrel nʼụbọchị ahụ.